7“Wuonụ ụgbọala ọhụrụ, werekwanụ nne ehi abụọ na-enye ụmụ ara kegide nʼụgbọ ahụ. Ehi ndị a ga-abụ ndị a na-ejibeghị kọọ ọrụ ubi mbụ. Mgbe unu kegidere ehi ndị a, chịrịnụ ụmụ ha chụba ha nʼebe a na-edebe ehi.
8Werenụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị tinye nʼụgbọala ahụ, tinyekwa ihe ọlaedo ndị ahụ unu na-enye ka ọ bụrụ aja ikpe ọmụma unu nʼime igbe nta unu ga-etinye nʼakụkụ ya. Zilaganụ ya nʼụzọ ọ ga-agbaso.
9Ma guzonụ na-ele ya anya. Ọ bụrụ na ọ gafee oke ala anyị banye Bet-Shemesh, unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị mere ka ihe ọjọọ ndị a dakwasị anyị. Ma ọ bụrụ na o meghị otu a, ọ bụrụ na ọ lọghachi, anyị ga-amata na ihe otiti a bụ naanị ihe ndaba nke dakwasịrị anyị, o sikwaghị nʼaka Onyenwe anyị.”
10Ha were dịka okwu ndị a si dị. Ha weere nne ehi abụọ na-enye ụmụ ara kegide ha nʼụgbọala ahụ, werekwa ụmụ ha kpọchie nʼọgba anụ.
11Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na igbe nta ahụ e tinyere oke na oyiyi etuto ọlaedo ndị ahụ a kpụrụ akpụ ka ha dọkwasịrị nʼelu ụgbọala ahụ.