1 Samuel 9

Sọl sịrị odibo ya, “Ọ dị mma, Bịa ka anyị gaa.” Ha biliri gawa nʼobodo ebe onye Chineke ahụ nọ.

1 Samuel 9:10 (UKJV) Then said Saul to his servant, Well said; come, let us go. So they went unto the city where the man of God was.

8Onyeozi ahụ zara ya ọzọ sị, “Lee, enwere m otu mkpụrụ shekel ọlaọcha. Aga m enye ya onye Chineke a ka ọ gwa anyị ụzọ anyị ga-esi.”

9(Na mgbe gara aga nʼIzrel, ọ bụrụ na mmadụ agaa iju Chineke ase, ọ na-asị, “Bịa ka anyị jekwuru onye ọhụ ụzọ,” nʼihi na onye a na-akpọ onye amụma taa, ka a na-akpọ onye ọhụ ụzọ nʼoge ahụ).

10Sọl sịrị odibo ya, “Ọ dị mma, Bịa ka anyị gaa.” Ha biliri gawa nʼobodo ebe onye Chineke ahụ nọ.

11Mgbe ha na-arịgo ugwu ịbanye obodo ahụ, ha zutere ụfọdụ ụmụ agbọghọ ka ha na-apụta iseta mmiri, jụọ ha ajụjụ sị, “Onye ọhụ ụzọ ahụ ọ nọ nʼebe a?”

12Ụmụ agbọghọ ahụ zara ha sị, “E, ọ nọ ya. Lee ya ka ọ na-aga nʼihu unu. Unu jesie ike unu ga-ahụ ya. Ugbu a ka ọ batara obodo anyị, nʼihi na ọ na-aga iso ndị mmadụ gaa ịchụ aja nʼebe dị elu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.