1 Samuel 9

Mgbe ha na-arịgo ugwu ịbanye obodo ahụ, ha zutere ụfọdụ ụmụ agbọghọ ka ha na-apụta iseta mmiri, jụọ ha ajụjụ sị, “Onye ọhụ ụzọ ahụ ọ nọ nʼebe a?”

1 Samuel 9:11 (UKJV) And as they went up the hill to the city, they found young maidens going out to draw water, and said unto them, Is the seer here?

9(Na mgbe gara aga nʼIzrel, ọ bụrụ na mmadụ agaa iju Chineke ase, ọ na-asị, “Bịa ka anyị jekwuru onye ọhụ ụzọ,” nʼihi na onye a na-akpọ onye amụma taa, ka a na-akpọ onye ọhụ ụzọ nʼoge ahụ).

10Sọl sịrị odibo ya, “Ọ dị mma, Bịa ka anyị gaa.” Ha biliri gawa nʼobodo ebe onye Chineke ahụ nọ.

11Mgbe ha na-arịgo ugwu ịbanye obodo ahụ, ha zutere ụfọdụ ụmụ agbọghọ ka ha na-apụta iseta mmiri, jụọ ha ajụjụ sị, “Onye ọhụ ụzọ ahụ ọ nọ nʼebe a?”

12Ụmụ agbọghọ ahụ zara ha sị, “E, ọ nọ ya. Lee ya ka ọ na-aga nʼihu unu. Unu jesie ike unu ga-ahụ ya. Ugbu a ka ọ batara obodo anyị, nʼihi na ọ na-aga iso ndị mmadụ gaa ịchụ aja nʼebe dị elu.

13Ngwangwa unu banye nʼobodo, unu ga-ahụ ya tupu o gaa nʼebe dị elu iri ihe. Nʼihi na ndị mmadụ agaghị ebido iri ihe tutu ruo mgbe o rutere, nʼihi na ọ ghaghị ịgọzi ihe aja ahụ tupu ndị a kpọrọ oku ebido iri ihe. Gbagoonụ unu ga-ahụ ya nʼoge dịka nke a.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.