14Ya mere, ha mere ngwangwa, baa nʼime obodo ahụ. Dịka ha na-abata nʼime obodo, lee Samuel ka ọ na-abịakwute ha; ọ na-aga nʼebe ahụ dị elu.
15Ma nʼụbọchị bọrọ tupu ụbọchị Sọl na-abịa, Onyenwe anyị kpughere nke a nye Samuel.
16“Dịka mgbe a echi, aga m ezitere gị otu nwoke sị nʼala Benjamin. Ị ga-ete ya mmanụ nke ga-eme ya ka ọ bụrụ onyendu Izrel ndị m. Ọ ga-azọpụta ha site nʼaka ndị Filistia, nʼihi na ahụla m ahụhụ nke ha nọ nʼime ya; anụkwala m ịkwa akwa ha.”
17Mgbe Samuel hụrụ Sọl, Onyenwe anyị gwara ya sị, “Lee nwoke ahụ m gwara gị ihe banyere ya! Ọ bụ ya ga-achị ndị m.”
18Ma Sọl bịaruru Samuel nso jụọ ya sị, “Biko, zi m ebe ụlọ onye ọhụ ụzọ dị.”