7Nʼụzọ dị otu a, unu ghọrọ ihe ilere anya nye ndị niile kwere ekwe nọ na Masidonia na Akaịa.
8Ugbu a, e sitela na ndụ unu mee ka oziọma Onyenwe anyị gbasaa gabiga Masidonia na Akaịa. Nʼihi na a na-anụ ihe banyere okwukwe unu nwere na Chineke nʼebe niile. Ya mere, ọ dịkwaghị mkpa ka anyị kwuo ihe banyere ya.
9Nʼihi na ha onwe ha na-ebu ụzọ gwa anyị ihe banyere nnabata unu nabatara anyị, na otu unu si site nʼikpere arụsị tụgharịa, bido ife Chineke dị ndụ, onye bụkwa ezi Chineke,
10na i chere Ọkpara ya onye ga-esi nʼeluigwe, onye o sitere na ndị nwụrụ anwụ kulite, Jisọs, onye na-anapụta anyị nʼiwe nke na-abịa.