1 Ndị Tesalonaịka 5

Ọ nwụrụ nʼihi anyị ka ọ bụrụ, ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị ga-esoro ya dịrị ndụ.

1 Thessalonians 5:10 (UKJV) Who died for us, that, whether we wake or sleep, we should live together with him.

8Ma ebe anyị niile bụ ndị nke ihe, ka anyị bụrụ ndị anya doro, ndị yi okwukwe na ịhụnanya dịka ihe ikpuchi obi, yikwasịkwa olileanya nke nzọpụta dị ka okpu igwe.

9Nʼihi na Chineke akwadebeghị ikpe ọmụma na egwu nye anyị. Kama ka anyị nweta nzọpụta site nʼokwukwe anyị nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.

10Ọ nwụrụ nʼihi anyị ka ọ bụrụ, ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị ga-esoro ya dịrị ndụ.

11Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme.

12Anyị na-arịọsị unu ike, ụmụnna, ka unu na-asọpụrụ ndị niile na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼihi unu, ndị ahụ na-elekọta unu nʼime ọrụ Onyenwe anyị, na ndị ahụ na-adụ unu ọdụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.