1 Ndị Tesalonaịka 5

Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme.

1 Thessalonians 5:11 (UKJV) Wherefore comfort yourselves together, and edify one another, even as also all of you do.

9Nʼihi na Chineke akwadebeghị ikpe ọmụma na egwu nye anyị. Kama ka anyị nweta nzọpụta site nʼokwukwe anyị nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.

10Ọ nwụrụ nʼihi anyị ka ọ bụrụ, ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị ga-esoro ya dịrị ndụ.

11Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme.

12Anyị na-arịọsị unu ike, ụmụnna, ka unu na-asọpụrụ ndị niile na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼihi unu, ndị ahụ na-elekọta unu nʼime ọrụ Onyenwe anyị, na ndị ahụ na-adụ unu ọdụ.

13Ka unu na-akwanyere ha ugwu site nʼịhụnanya nʼihi ụdị ọrụ ha na-arụ. Ka unu na mmadụ ibe unu birikwa nʼudo.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.