10Ọ nwụrụ nʼihi anyị ka ọ bụrụ, ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị ga-esoro ya dịrị ndụ.
11Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme.
12Anyị na-arịọsị unu ike, ụmụnna, ka unu na-asọpụrụ ndị niile na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼihi unu, ndị ahụ na-elekọta unu nʼime ọrụ Onyenwe anyị, na ndị ahụ na-adụ unu ọdụ.
13Ka unu na-akwanyere ha ugwu site nʼịhụnanya nʼihi ụdị ọrụ ha na-arụ. Ka unu na mmadụ ibe unu birikwa nʼudo.
14Ma ugbu a, anyị na-arịọ unu, ụmụnna, na-adụnụ ndị na-anọ nkịtị ọdụ, na-agbanụ ndị dara mba ume, nyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nwekwanụ ndidi nʼebe ha niile nọ.