9Ma emeghị iwu nʼihi ndị ezi omume. Kama, e mere iwu nʼihi ndị ahụ na-emebi iwu na ndị na-enupu isi, ndị kpọrọ Chineke asị na ndị mmehie, ndị rụrụ arụ, ndị na-egbu nna ha na nne ha, na ndị na-egbu mmadụ ibe ha,
10na ndị na-akwa iko na ndị ikom na-emerụ onwe ha nʼahụ ndị ikom ibe ha, ndị na-azụ ahịa ndị ohu, na ndị ụgha niile, na ndị na-agba ama ụgha, tinyere ihe ndị ahụ niile megidere ezi ozizi ahụ,
11nke dabara nʼoziọma ahụ dị ebube, nke Chineke dị ngọzị, nke o nyefere m nʼaka na ntụkwasị obi ichebe.
12Ana m ekele Kraịst Jisọs Onyenwe anyị ekele, onye na-enye m ike, nʼihi na ọ gụrụ m dị ka onye e kwesiri ịtụkwasị obi mgbe ọ họpụtara m ijere ya ozi.
13Ọ bụ ezie na nʼoge gara aga, abụ m onye na-ekwujọ Chineke na onye na-akpagbu ndị ya, bụrụkwa onye na-emegide emegide. Ma Chineke meere m ebere nʼihi na m mere ihe ndị ahụ nʼọnọdụ amaghị ihe, na enweghị okwukwe.