1 Timoti 1

Ọ bụ ezie na nʼoge gara aga, abụ m onye na-ekwujọ Chineke na onye na-akpagbu ndị ya, bụrụkwa onye na-emegide emegide. Ma Chineke meere m ebere nʼihi na m mere ihe ndị ahụ nʼọnọdụ amaghị ihe, na enweghị okwukwe.

1 Timothy 1:13 (UKJV) Who was before a blasphemer, and a persecutor, and prone to cause hurt: but I obtained mercy, because I did it ignorantly in unbelief.

11nke dabara nʼoziọma ahụ dị ebube, nke Chineke dị ngọzị, nke o nyefere m nʼaka na ntụkwasị obi ichebe.

12Ana m ekele Kraịst Jisọs Onyenwe anyị ekele, onye na-enye m ike, nʼihi na ọ gụrụ m dị ka onye e kwesiri ịtụkwasị obi mgbe ọ họpụtara m ijere ya ozi.

13Ọ bụ ezie na nʼoge gara aga, abụ m onye na-ekwujọ Chineke na onye na-akpagbu ndị ya, bụrụkwa onye na-emegide emegide. Ma Chineke meere m ebere nʼihi na m mere ihe ndị ahụ nʼọnọdụ amaghị ihe, na enweghị okwukwe.

14Ma Onyenwe anyị wụkwasịrị m amara ya, nke babigara ụba oke, ya na okwukwe na ịhụnanya nʼime Kraịst Jisọs.

15Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka anabata ya nke ọma: Kraịst Jisọs bịara nʼụwa ịzọpụta ndị mmehie, nke mụ onwe m bụ onyeisi ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.