9Achọkwara m ka ndị inyom kwadoo onwe ha nʼụzọ kwesiri ekwesi, ka ha jiri nsọpụrụ na uche zuruoke chọọ onwe ha mma. Ọ bụghị isi a kpara akpa, ma ọ bụkwanụ ngwa mma nke ọlaedo maọbụ pieal, maọbụ uwe dị oke ọnụahịa ha na-eyi.
10Kama site nʼezi ọrụ ọma ha nke kwesiri ndị inyom na-ekwupụta na ha na-ekpere Chineke.
11Nwanyị kwesikwara iji obi dị umeala na obi dị nwayọọ gee ntị mụtakwa ihe mgbe a na-ezi ihe.
12Ekwenyeghị m ka nwanyị zie ihe, maọbụ ka ọ bụrụ onyeisi nʼebe ndị nwoke nọ. Ha kwesiri ịnọ nwayọọ mgbe ọbụla unu zukọrọ.
13Ọ bụ nʼihi na e buru ụzọ kee Adam tupu e kee Iiv.