1 Timoti 2

Ọ bụ nʼihi na e buru ụzọ kee Adam tupu e kee Iiv.

1 Timothy 2:13 (UKJV) For Adam was first formed, then Eve.

11Nwanyị kwesikwara iji obi dị umeala na obi dị nwayọọ gee ntị mụtakwa ihe mgbe a na-ezi ihe.

12Ekwenyeghị m ka nwanyị zie ihe, maọbụ ka ọ bụrụ onyeisi nʼebe ndị nwoke nọ. Ha kwesiri ịnọ nwayọọ mgbe ọbụla unu zukọrọ.

13Ọ bụ nʼihi na e buru ụzọ kee Adam tupu e kee Iiv.

14Ọ bụkwaghị Adam ka a ghọgburu, kama ọ bụ nwanyị ka a ghọgburu mee ka ọ bụrụ onye mmebi iwu.

15Ma a ga-azọpụta ha site nʼọmụmụ nwa ma ọ bụrụ na ha anọgide na-ebi ndụ okwukwe na ịhụnanya, na ịdị nsọ, na nke uche zuruoke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.