3Nke a bụkwa ihe dị mma na ihe na-atọ Chineke Onye nzọpụta anyị ezi ụtọ.
4Onye chọrọ ka a zọpụta mmadụ niile, ka ha niile bịaruo na mmazu nke eziokwu.
5Nʼihi na ọ bụ naanị otu Chineke dị. Ọ bụkwa naanị otu onye ogbugbo dị nʼetiti Chineke na mmadụ. Kraịst Jisọs, onye ya onwe ya bụ mmadụ.
6Onye weere onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nʼihi mmadụ niile, nke bụ ịgba ama a na-enye nʼoge ya.
7Nʼihi nke a, a họpụtara m ka m bụrụ ọnụ na-ekwuru ọha nakwa onyeozi, na onye nkuzi nye ndị mba ọzọ banyere ezi okwukwe ahụ. Eziokwu ka m na-ekwu, anaghị m agha ụgha.