1 Timoti 2

Onye weere onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nʼihi mmadụ niile, nke bụ ịgba ama a na-enye nʼoge ya.

1 Timothy 2:6 (UKJV) Who gave himself a ransom for all, to be testified in due time.

4Onye chọrọ ka a zọpụta mmadụ niile, ka ha niile bịaruo na mmazu nke eziokwu.

5Nʼihi na ọ bụ naanị otu Chineke dị. Ọ bụkwa naanị otu onye ogbugbo dị nʼetiti Chineke na mmadụ. Kraịst Jisọs, onye ya onwe ya bụ mmadụ.

6Onye weere onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nʼihi mmadụ niile, nke bụ ịgba ama a na-enye nʼoge ya.

7Nʼihi nke a, a họpụtara m ka m bụrụ ọnụ na-ekwuru ọha nakwa onyeozi, na onye nkuzi nye ndị mba ọzọ banyere ezi okwukwe ahụ. Eziokwu ka m na-ekwu, anaghị m agha ụgha.

8Nʼihi nke a, achọrọ m ka ndị ikom, nʼebe niile na-achili aka dị nsọ elu nʼekpere, na-ebughị iwe nʼobi, na-arụkwaghị ụka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.