1 Timoti 5

Egela ntị nʼebubo ọjọọ ọbụla a na-ebo onye okenye karịakwa maọbụ na ndị akaebe abụọ maọbụ atọ gbara ama megide ya.

1 Timothy 5:19 (UKJV) Against an elder receive not an accusation, but before two or three witnesses.

17Nye ndị okenye, ndị na-achị nke ọma nsọpụrụ kwesiri ekwesi na ụgwọ ọrụ okpukpu abụọ, ọkachasị ndị na-adọgbu onwe ha nʼọrụ izi oziọma na nʼikuzi ihe.

18Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru, “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka,” hapụ ya ka ọ na-eri nri mgbe ọ na-arụ ọrụ, ọzọkwa, “Onye na-arụ ọrụ kwesiri ịnata ụgwọ ọrụ ya.”

19Egela ntị nʼebubo ọjọọ ọbụla a na-ebo onye okenye karịakwa maọbụ na ndị akaebe abụọ maọbụ atọ gbara ama megide ya.

20Ma ndị okenye ahụ nọgidere na-eme mmehie, kpọpụta ha baara ha mba nʼihu mmadụ niile, ka ndị ọzọ tụọ egwu gharakwa iso omume ha.

21Ana m adọ unu aka na ntị nʼihu Chineke na nʼihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nʼihu ndị mmụọ ozi a họpụtara, ka unu debe ụkpụrụ ndị a niile, nye onye ọbụla ntaramahụhụ nke ruru ya, elekwala onye ọbụla anya nʼihu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.