18Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru, “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka,” hapụ ya ka ọ na-eri nri mgbe ọ na-arụ ọrụ, ọzọkwa, “Onye na-arụ ọrụ kwesiri ịnata ụgwọ ọrụ ya.”
19Egela ntị nʼebubo ọjọọ ọbụla a na-ebo onye okenye karịakwa maọbụ na ndị akaebe abụọ maọbụ atọ gbara ama megide ya.
20Ma ndị okenye ahụ nọgidere na-eme mmehie, kpọpụta ha baara ha mba nʼihu mmadụ niile, ka ndị ọzọ tụọ egwu gharakwa iso omume ha.
21Ana m adọ unu aka na ntị nʼihu Chineke na nʼihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nʼihu ndị mmụọ ozi a họpụtara, ka unu debe ụkpụrụ ndị a niile, nye onye ọbụla ntaramahụhụ nke ruru ya, elekwala onye ọbụla anya nʼihu.
22Ebikwasịkwala onye ọbụla aka nʼisi ọsịịsọ ime ya okenye maọbụ onye na-eje ozi. Ekwela ka i keta oke na mmehie ndị ọzọ. Debe onwe gị ọcha.