20Ma ndị okenye ahụ nọgidere na-eme mmehie, kpọpụta ha baara ha mba nʼihu mmadụ niile, ka ndị ọzọ tụọ egwu gharakwa iso omume ha.
21Ana m adọ unu aka na ntị nʼihu Chineke na nʼihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nʼihu ndị mmụọ ozi a họpụtara, ka unu debe ụkpụrụ ndị a niile, nye onye ọbụla ntaramahụhụ nke ruru ya, elekwala onye ọbụla anya nʼihu.
22Ebikwasịkwala onye ọbụla aka nʼisi ọsịịsọ ime ya okenye maọbụ onye na-eje ozi. Ekwela ka i keta oke na mmehie ndị ọzọ. Debe onwe gị ọcha.
23Aṅụkwala naanị mmiri ọzọ, na-aṅụ ntakịrị mmanya maka afọ gị na nrịa nrịa nke na-arịa gị ọtụtụ mgbe.
24Mmehie ụfọdụ mmadụ na-apụta ihe ma na-ebukwa ha ụzọ rụọ oche ikpe, ma ndị ọzọ ka a na-ahụta mmehie ha nʼoge ikpeazụ.