1 Timoti 6

Onye ọbụla na-ezi ihe ọzọ nke na-adabaghị nʼokwu ezi ntọala na-enye ndụ nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ya na ozizi nke ibi ndụ kwesiri onye nke Chineke,

1 Timothy 6:3 (UKJV) If any man teach otherwise, and consent not to wholesome words, even the words of our Lord Jesus Christ, and to the doctrine which is according to godliness;

1Ndị niile bụ ohu ga-ahụ ndị nwe ha dị ka ndị ekwesiri inye ugwu na nsọpụrụ, ka a ghara ikwujọ aha Chineke na ozizi anyị.

2Ndị nke nwere ndị kwere ekwe dịka ndị nwe ha ekwesighị ilelị ha anya nʼihi na ha bụ ụmụnna ha. Kama, ha kwesiri ijere ndị nwe ha ozi nke ọma karịa, nʼihi na ndị na-erite uru nʼọrụ ha bụ ndị kwere ekwe bụrụkwa ndị anyị hụrụ nʼanya. Ihe ndị a ka ị ga-akụziri ha, dụkwaa ha ọdụ banyere ime nke a.

3Onye ọbụla na-ezi ihe ọzọ nke na-adabaghị nʼokwu ezi ntọala na-enye ndụ nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ya na ozizi nke ibi ndụ kwesiri onye nke Chineke,

4bụ onye nganga na-afụli elu, ma bụrụkwa onye na-amaghị ihe. Ọchịchọ obi ya bụ nke na-ezighị ezi ma jupụtakwa nʼịrụ ụka na ekworo nke na-eweta ịkpọ asị na esemokwu, na nkwulu nakwa ajọ echiche,

5na isi ịrụ ụka niile nke na-esite nʼaka ụmụ mmadụ ndị echiche ha na-enweghịkwa eziokwu. Ha na-eche na ife Chineke bụ ụzọ e si aba ọgaranya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.