2 Ihe E Mere 11

Ndị Livayị hapụchara ebe ịta nri anụ ụlọ ha na ihe niile ha nwere bịa biri na Juda na Jerusalem, nʼihi na Jeroboam na ụmụ ya ndị ikom jụrụ ha dịka ndị nchụaja Onyenwe anyị.

2 Chronicles 11:14 (UKJV) For the Levites left their suburbs and their possession, and came to Judah and Jerusalem: for Jeroboam and his sons had cast them off from executing the priest's office unto the LORD:

12O tinyere ọta na ùbe nʼebe niile a na-edebe ngwa agha nʼobodo niile, nʼihi iche obodo ya nke ọma, ebe ọ bụ naanị Juda na Benjamin nọ nʼokpuru ya.

13Ma ndị nchụaja niile na ndị Livayị ndị sitere nʼakụkụ niile nke Izrel dịnyere ya.

14Ndị Livayị hapụchara ebe ịta nri anụ ụlọ ha na ihe niile ha nwere bịa biri na Juda na Jerusalem, nʼihi na Jeroboam na ụmụ ya ndị ikom jụrụ ha dịka ndị nchụaja Onyenwe anyị.

15Ọ họpụtara ndị nchụaja nke aka ya, maka ebe niile dị elu, nakwa ife arụsị ewu na nwa ehi ndị ahụ ọ kpụrụ.

16Ndị si nʼebo niile nke Izrel, ndị kpebiri nʼobi ha ịchọ Onyenwe anyị, Chineke Izrel sooro ndị Livayị bịa Jerusalem ịchụ aja nye Onyenwe anyị Chineke nna nna ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.