2 Ihe E Mere 11

Ndị si nʼebo niile nke Izrel, ndị kpebiri nʼobi ha ịchọ Onyenwe anyị, Chineke Izrel sooro ndị Livayị bịa Jerusalem ịchụ aja nye Onyenwe anyị Chineke nna nna ha.

2 Chronicles 11:16 (UKJV) And after them out of all the tribes of Israel such as set their hearts to seek the LORD God of Israel came to Jerusalem, to sacrifice unto the LORD God of their fathers.

14Ndị Livayị hapụchara ebe ịta nri anụ ụlọ ha na ihe niile ha nwere bịa biri na Juda na Jerusalem, nʼihi na Jeroboam na ụmụ ya ndị ikom jụrụ ha dịka ndị nchụaja Onyenwe anyị.

15Ọ họpụtara ndị nchụaja nke aka ya, maka ebe niile dị elu, nakwa ife arụsị ewu na nwa ehi ndị ahụ ọ kpụrụ.

16Ndị si nʼebo niile nke Izrel, ndị kpebiri nʼobi ha ịchọ Onyenwe anyị, Chineke Izrel sooro ndị Livayị bịa Jerusalem ịchụ aja nye Onyenwe anyị Chineke nna nna ha.

17Ha mere ka alaeze Juda sie ike. Ha kwagidekwara Rehoboam nwa Solomọn afọ atọ, na-agbasokwa nʼụzọ niile nke Devid na Solomọn nʼoge a.

18Rehoboam, lụrụ Mahalat, bụ nwa nwanyị Jerimot nwa Devid, na Abihail, nwa nwanyị Eliab, nwa Jesi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.