2 Ihe E Mere 11

Rehoboam, lụrụ Mahalat, bụ nwa nwanyị Jerimot nwa Devid, na Abihail, nwa nwanyị Eliab, nwa Jesi.

2 Chronicles 11:18 (UKJV) And Rehoboam took him Mahalath the daughter of Jerimoth the son of David to wife, and Abihail the daughter of Eliab the son of Jesse;

16Ndị si nʼebo niile nke Izrel, ndị kpebiri nʼobi ha ịchọ Onyenwe anyị, Chineke Izrel sooro ndị Livayị bịa Jerusalem ịchụ aja nye Onyenwe anyị Chineke nna nna ha.

17Ha mere ka alaeze Juda sie ike. Ha kwagidekwara Rehoboam nwa Solomọn afọ atọ, na-agbasokwa nʼụzọ niile nke Devid na Solomọn nʼoge a.

18Rehoboam, lụrụ Mahalat, bụ nwa nwanyị Jerimot nwa Devid, na Abihail, nwa nwanyị Eliab, nwa Jesi.

19Ọ mụtaara ya ụmụ ndị ikom atọ ndị a: Jeush, na Shemaraya, na Zaham.

20Emesịa, ọ lụkwara nwunye ọzọ aha ya bụ Maaka, nwa nwanyị Absalọm. Ụmụ ha mụtara bụ Abija, na Atai, na Ziza, na Shelomit.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.