1Ma mgbe e mere ka alaeze Rehoboam guzosie ike, mgbe ọ dịkwa ike, ọ hapụrụ iwu Onyenwe anyị ya na ndị Izrel niile.
2Nʼihi na ha ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, Shishak eze Ijipt busoro Jerusalem agha nʼafọ nke ise nke ọchịchị eze Rehoboam.
3O ji otu puku ụgbọ agha na narị abụọ, na ndị agha na-agba ịnyịnya dị puku iri isii, na ndị agha ụkwụ ala, ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị agha si Libịa, Sukim na Kush, ndị sooro ya site nʼala Ijipt.
4O merikwara obodo niile e wusiri ike nke Juda ma bịarukwaa Jerusalem.