2 Ihe E Mere 12

O ji otu puku ụgbọ agha na narị abụọ, na ndị agha na-agba ịnyịnya dị puku iri isii, na ndị agha ụkwụ ala, ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị agha si Libịa, Sukim na Kush, ndị sooro ya site nʼala Ijipt.

2 Chronicles 12:3 (UKJV) With twelve hundred chariots, and threescore thousand horsemen: and the people were without number that came with him out of Egypt; the Lubims, the Sukkiims, and the Ethiopians.

1Ma mgbe e mere ka alaeze Rehoboam guzosie ike, mgbe ọ dịkwa ike, ọ hapụrụ iwu Onyenwe anyị ya na ndị Izrel niile.

2Nʼihi na ha ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, Shishak eze Ijipt busoro Jerusalem agha nʼafọ nke ise nke ọchịchị eze Rehoboam.

3O ji otu puku ụgbọ agha na narị abụọ, na ndị agha na-agba ịnyịnya dị puku iri isii, na ndị agha ụkwụ ala, ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị agha si Libịa, Sukim na Kush, ndị sooro ya site nʼala Ijipt.

4O merikwara obodo niile e wusiri ike nke Juda ma bịarukwaa Jerusalem.

5Mgbe ahụ, Shemaya onye amụma bịakwutere Rehoboam na ndịisi Juda niile, ndị zukọtara na Jerusalem nʼihi egwu Shishak, sị ha, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, ‘Unu ahapụla m, nʼihi ya, ahapụkwala m unu, nyefee unu nʼaka Shishak.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.