2 Ihe E Mere 14

O nyere Juda iwu ka ha chọọ Onyenwe anyị Chineke nke nna ha, ka ha debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile.

2 Chronicles 14:4 (UKJV) And commanded Judah to seek the LORD God of their fathers, and to do the law and the commandment.

2Asa mere ihe dị mma na nke ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị bụ Chineke ya.

3Ọ wezugakwara ebe ịchụ aja nke chi ọzọ niile dị nʼugwu, tipịa ogidi nsọ niile, gbujasịakwa ogidi Ashera.

4O nyere Juda iwu ka ha chọọ Onyenwe anyị Chineke nke nna ha, ka ha debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile.

5O wezugakwara ebe niile a na-efe arụsị nʼelu ugwu, bibiekwa ebe niile a na-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼobodo Juda. Alaeze ahụ nwekwara udo nʼokpuru ọchịchị ya.

6O wuru ọtụtụ obodo e ji mgbidi gbaa gburugburu nʼala Juda niile. O nweghị onye busoro ya agha, nʼihi na Onyenwe anyị nyere ya udo.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.