1Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị Azaraya nwa Oded.
2Ọ pụrụ jekwuru Asa sị ya, “Geenụ m ntị, gị Asa na ndị Juda niile na Benjamin. Onyenwe anyị ga-anọnyere unu oge niile unu na-eme okwu ya. Unu ga-achọta ya mgbe ọbụla unu chọrọ ya. Ma ọ ga-agbakụta unu azụ oge ọbụla unu nupuru isi nʼiwu ya.
3Ma ọtụtụ oge dị anya ndị Izrel nọ na-enweghị Chineke nke ezie, ha enweghịkwa onye nchụaja ga-ezi ihe, ha enweghịkwa iwu Chineke