4kama ọ chọrọ Onyenwe anyị, Chineke nna ya, dobekwa iwu ya niile, ọ bụghịkwa dịka omume ndị Izrel si dị.
5Nʼihi nke a Onyenwe anyị mere ka ọchịchị ya guzosie ike. Ndị Juda niile tụkwara ụtụ ha dịka o kwesiri wetara Jehoshafat, nke a mere ka o nwee akụnụba ebe ọ dị ukwuu, nwekwa nsọpụrụ.
6O ji obi ya niile gbasoo ụzọ Onyenwe anyị. Ọzọkwa, o sitere na Juda wezuga ebe niile dị elu nakwa ogidi Ashera niile.
7Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị ya, o zipụrụ ndịisi ọchịchị alaeze ya ndị a, Ben-Hail, Ọbadaya, Zekaraya, Netanel na Mikaya ka ha gaa zie ndị mmadụ ihe nʼobodo niile nke Juda.
8Ụfọdụ ndị Livayị ndị a sokwa gaa: Shemaya, Netanaya, Zebadaya, Asahel, Shemiramot, Jehonatan, Adonaịja, Tobaija, Tob-Adonaịja na ndị nchụaja ụfọdụ, ndị dị ka Elishama na Jehoram.