6O ji obi ya niile gbasoo ụzọ Onyenwe anyị. Ọzọkwa, o sitere na Juda wezuga ebe niile dị elu nakwa ogidi Ashera niile.
7Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị ya, o zipụrụ ndịisi ọchịchị alaeze ya ndị a, Ben-Hail, Ọbadaya, Zekaraya, Netanel na Mikaya ka ha gaa zie ndị mmadụ ihe nʼobodo niile nke Juda.
8Ụfọdụ ndị Livayị ndị a sokwa gaa: Shemaya, Netanaya, Zebadaya, Asahel, Shemiramot, Jehonatan, Adonaịja, Tobaija, Tob-Adonaịja na ndị nchụaja ụfọdụ, ndị dị ka Elishama na Jehoram.
9Ha ji akwụkwọ iwu Onyenwe anyị, zie ihe na Juda. Ha jere gburugburu obodo niile nke Juda na-ezi ndị mmadụ ihe.
10Egwu Onyenwe anyị dakwasịrị alaeze niile dị gburugburu Juda, nʼihi ya, ha ebukwaghị agha megide Jehoshafat.