2 Ihe E Mere 17

Ha ji akwụkwọ iwu Onyenwe anyị, zie ihe na Juda. Ha jere gburugburu obodo niile nke Juda na-ezi ndị mmadụ ihe.

2 Chronicles 17:9 (UKJV) And they taught in Judah, and had the book of the law of the LORD with them, and went about throughout all the cities of Judah, and taught the people.

7Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị ya, o zipụrụ ndịisi ọchịchị alaeze ya ndị a, Ben-Hail, Ọbadaya, Zekaraya, Netanel na Mikaya ka ha gaa zie ndị mmadụ ihe nʼobodo niile nke Juda.

8Ụfọdụ ndị Livayị ndị a sokwa gaa: Shemaya, Netanaya, Zebadaya, Asahel, Shemiramot, Jehonatan, Adonaịja, Tobaija, Tob-Adonaịja na ndị nchụaja ụfọdụ, ndị dị ka Elishama na Jehoram.

9Ha ji akwụkwọ iwu Onyenwe anyị, zie ihe na Juda. Ha jere gburugburu obodo niile nke Juda na-ezi ndị mmadụ ihe.

10Egwu Onyenwe anyị dakwasịrị alaeze niile dị gburugburu Juda, nʼihi ya, ha ebukwaghị agha megide Jehoshafat.

11Ụfọdụ nʼime ndị Filistia wetaara ya onyinye na ọlaọcha kwa afọ nʼụzọ ịkwanyere ya ugwu, ma ndị Arab, wetaara ya igwe anụ ụlọ dị puku ebule asaa na narị asaa, na puku mkpi asaa na narị asaa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.