2Jehu nwa Hanani, onye ọhụ ọhụ, pụrụ gaa izute ya; ọ sịrị eze Jehoshafat, “O kwesiri ka i nyere onye ọjọọ aka? Ọ bụkwa ndị na-akpọ Onyenwe anyị asị ka ị na-ahụ nʼanya? Nʼihi nke a iwe ọkụ Onyenwe anyị adakwasịla gị.
3Ma otu ọ dị, achọtara ezi ihe nʼime gị, i sitela nʼala a wezuga ogidi Ashera niile, dozieekwa obi gị ịchọ Chineke.”
4Jehoshafat biri na Jerusalem. Ọ pụrụ gagharịa nʼetiti ndị ya site na Bịasheba ruo nʼobodo ugwu ugwu Ifrem, laghachikwutekwa Onyenwe anyị, bụ Chineke nke nna nna ha.
5Ọ họpụtara ndị ikpe nʼala ahụ, nʼotu nʼotu nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike nke Juda.
6Ọ gwara ha si, “Lezienụ anya ihe unu na-eme nʼihi na ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe kama ọ bụ Onyenwe anyị, onye na-anọnyere unu mgbe unu na-ekpebi ikpe.