2 Ihe E Mere 20

Mgbe oge nta gasịrị, eze ndị Moab na nke ndị Amọn, na ndị ọzọkwa, bịara ibuso Jehoshafat na ndị Juda agha.

2 Chronicles 20:1 (UKJV) It came to pass after this also, that the children of Moab, and the children of Ammon, and with them other beside the Ammonites, came against Jehoshaphat to battle.

1Mgbe oge nta gasịrị, eze ndị Moab na nke ndị Amọn, na ndị ọzọkwa, bịara ibuso Jehoshafat na ndị Juda agha.

2Ụfọdụ ndị mmadụ bịara gwa Jehoshafat sị, “Lee, igwe usuu ndị agha na-abịa imegide gị site nʼEdọm, nakwa nʼofe osimiri Nnu (osimiri nwụrụ anwụ). Ha erutela Hazezọn Tama, ebe a na-akpọkwa En-Gedi.”

3Jehoshafat tụrụ egwu nke ukwuu, kpebiekwa ịchọ inyeaka Onyenwe anyị. Nʼihi nke a, ọ kpọsara obubu ọnụ nye ndị Juda niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.