2 Ihe E Mere 19

“Amaraya, onyeisi nchụaja, ga-abụ onyeisi unu nʼihe ọbụla metụtara Onyenwe anyị. Zebadaya nwa nwoke Ishmel, onyeisi nke ebo Juda ga-abụ onyeisi unu nʼihe o bụla metụtara eze. Ndị Livayị ga-abụ ndịisi ozi nʼihu unu. Bụrụkwanụ ndị dị ike, unu atụkwala ụjọ, ka Onyenwe anyị nọnyere ndị na-eme nke ọma.”

2 Chronicles 19:11 (UKJV) And, behold, Amariah the chief priest is over you in all matters of the LORD; and Zebadiah the son of Ishmael, the ruler of the house of Judah, for all the king's matters: also the Levites shall be officers before you. Deal courageously, and the LORD shall be with the good.

9O nyere ha iwu ndị a, “Jirinụ ikwesi ntụkwasị obi, na ịtụ egwu Onyenwe anyị rụọ ọrụ unu.

10Mgbe ọbụla ụmụnna unu ndị bi nʼobodo unu dị iche iche buteere unu ikpe igbu mmadụ maọbụ ikpe mmebi iwu ọbụla, maọbụ ihe megidere ihe e nyere nʼiwu, maọbụ nke megidere ụkpụrụ, ma ọ bụkwanụ megide iwu na usoro ime ihe, unu ga-adọ ha aka na ntị ka ha ghara imehie megide Onyenwe anyị. Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe Onyenwe anyị ga-adakwasị unu na ụmụnna unu. Ma ọ bụrụ na unu arụọ ọrụ unu nke ọma, unu agaghị emehie.

11“Amaraya, onyeisi nchụaja, ga-abụ onyeisi unu nʼihe ọbụla metụtara Onyenwe anyị. Zebadaya nwa nwoke Ishmel, onyeisi nke ebo Juda ga-abụ onyeisi unu nʼihe o bụla metụtara eze. Ndị Livayị ga-abụ ndịisi ozi nʼihu unu. Bụrụkwanụ ndị dị ike, unu atụkwala ụjọ, ka Onyenwe anyị nọnyere ndị na-eme nke ọma.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.