2 Ihe E Mere 20

Nʼụbọchị nke anọ ha zukọtara na Ndagwurugwu Beraka ebe ha nọ too Onyenwe anyị otuto. Ọ bụ nke a mere e ji akpọ ebe ahụ Ndagwurugwu Beraka ruo taa.

2 Chronicles 20:26 (UKJV) And on the fourth day they assembled themselves in the valley of Berachah; for there they blessed the LORD: therefore the name of the same place was called, The valley of Berachah, unto this day.

24Mgbe ndị agha Juda rutere ebe ha ga-esi lepụ anya hụ ihe na-eme nʼọzara ahụ, ha lepụrụ anya ịhụ usuu ndị agha ahụ, ma ihe ha hụrụ bụ ozu ndị agha tọgbọcha nʼala. Ọ dịkwaghị otu nʼime ndị agha ahụ gbapụrụ na ndụ.

25Ya mere Jehoshafat na ndị agha ya banyere nʼọgbọ agha ahụ kwakọrọ ihe nkwata nʼagha. Ha butere ọtụtụ ngwa agha, na uwe na ihe ndị ọzọ dị oke ọnụahịa ma ha enweghị ike ibutecha ihe niile. Ihe nkwata nʼagha hiri nne ruo na o were ha ụbọchị atọ ibutecha ha.

26Nʼụbọchị nke anọ ha zukọtara na Ndagwurugwu Beraka ebe ha nọ too Onyenwe anyị otuto. Ọ bụ nke a mere e ji akpọ ebe ahụ Ndagwurugwu Beraka ruo taa.

27Emesịa, Jehoshafat duuru ndị Juda na Jerusalem niile laghachi na Jerusalem nʼọṅụ, nʼihi na Onyenwe anyị emeelara ha ihe ha kwesiri iji ṅụrịa ọṅụ nʼebe ndị iro ha nọ.

28Ha ji une, na ụbọ akwara, na opi ike bata Jerusalem, gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.