25Ya mere Jehoshafat na ndị agha ya banyere nʼọgbọ agha ahụ kwakọrọ ihe nkwata nʼagha. Ha butere ọtụtụ ngwa agha, na uwe na ihe ndị ọzọ dị oke ọnụahịa ma ha enweghị ike ibutecha ihe niile. Ihe nkwata nʼagha hiri nne ruo na o were ha ụbọchị atọ ibutecha ha.
26Nʼụbọchị nke anọ ha zukọtara na Ndagwurugwu Beraka ebe ha nọ too Onyenwe anyị otuto. Ọ bụ nke a mere e ji akpọ ebe ahụ Ndagwurugwu Beraka ruo taa.
27Emesịa, Jehoshafat duuru ndị Juda na Jerusalem niile laghachi na Jerusalem nʼọṅụ, nʼihi na Onyenwe anyị emeelara ha ihe ha kwesiri iji ṅụrịa ọṅụ nʼebe ndị iro ha nọ.
28Ha ji une, na ụbọ akwara, na opi ike bata Jerusalem, gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
29Egwu Chineke dakwasịrị alaeze niile bi gburugburu, mgbe ha nụrụ otu Onyenwe anyị si lụọ ọgụ megide ndị iro Izrel niile.