26Nʼụbọchị nke anọ ha zukọtara na Ndagwurugwu Beraka ebe ha nọ too Onyenwe anyị otuto. Ọ bụ nke a mere e ji akpọ ebe ahụ Ndagwurugwu Beraka ruo taa.
27Emesịa, Jehoshafat duuru ndị Juda na Jerusalem niile laghachi na Jerusalem nʼọṅụ, nʼihi na Onyenwe anyị emeelara ha ihe ha kwesiri iji ṅụrịa ọṅụ nʼebe ndị iro ha nọ.
28Ha ji une, na ụbọ akwara, na opi ike bata Jerusalem, gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
29Egwu Chineke dakwasịrị alaeze niile bi gburugburu, mgbe ha nụrụ otu Onyenwe anyị si lụọ ọgụ megide ndị iro Izrel niile.
30Ya mere, udo dịrị nʼalaeze Jehoshafat, nʼihi na Chineke nyere ya udo.