27Emesịa, Jehoshafat duuru ndị Juda na Jerusalem niile laghachi na Jerusalem nʼọṅụ, nʼihi na Onyenwe anyị emeelara ha ihe ha kwesiri iji ṅụrịa ọṅụ nʼebe ndị iro ha nọ.
28Ha ji une, na ụbọ akwara, na opi ike bata Jerusalem, gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
29Egwu Chineke dakwasịrị alaeze niile bi gburugburu, mgbe ha nụrụ otu Onyenwe anyị si lụọ ọgụ megide ndị iro Izrel niile.
30Ya mere, udo dịrị nʼalaeze Jehoshafat, nʼihi na Chineke nyere ya udo.
31Jehoshafat ghọrọ eze juda. Ọ gbara iri afọ atọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze Juda. Ọ chịrị iri afọ abụọ na ise na Jerusalem. Aha nne ya bụ Azuba, nwa Shilhi.