2 Ihe E Mere 21

Ha ji ike bata Juda, buru ihe niile dị mma ha hụrụ nʼụlọeze, tinyere ụmụ nwoke ya niile na ndị nwunye ya niile. Ọ bụ naanị Ahazaya, nwa ya nwoke nke nta ka ha hapụrụ.

2 Chronicles 21:17 (UKJV) And they came up into Judah, and brake into it, and carried away all the substance that was found in the king's house, and his sons also, and his wives; so that there was not a son left him, save Jehoahaz, the youngest of his sons.

15Gị onwe gị kwa ga-ada nʼoke ọrịa, ọrịa afọ nke na-agaghị ekwe ngwọta. Ọrịa a ga-eme ka eriri afọ gị na-enupụta kwa ụbọchị.’ ”

16Onyenwe anyị mekwara ka ndị Filistia, na ndị Arab, ndị bi nso ndị Kush, bịa lụso Jehoram agha.

17Ha ji ike bata Juda, buru ihe niile dị mma ha hụrụ nʼụlọeze, tinyere ụmụ nwoke ya niile na ndị nwunye ya niile. Ọ bụ naanị Ahazaya, nwa ya nwoke nke nta ka ha hapụrụ.

18Ọ bụ mgbe nke a gasịrị ka Onyenwe anyị mere ka ọrịa afọ nke a na-apụghị ịgwọta agwọta bịakwasị Jehoram.

19Mgbe afọ abụọ gasịrị, eriri afọ ya nupụtara nʼihi ọrịa ahụ. Ọ nwụkwara nʼoke ihe mgbu. Mgbe e liri ya, e meghị omenaala ịkwanye ọkụ olili dịka a na-eme nʼoge a na-eli ndị eze.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.