2 Ihe E Mere 21

Mgbe afọ abụọ gasịrị, eriri afọ ya nupụtara nʼihi ọrịa ahụ. Ọ nwụkwara nʼoke ihe mgbu. Mgbe e liri ya, e meghị omenaala ịkwanye ọkụ olili dịka a na-eme nʼoge a na-eli ndị eze.

2 Chronicles 21:19 (UKJV) And it came to pass, that in process of time, after the end of two years, his bowels fell out by reason of his sickness: so he died of sore diseases. And his people made no burning for him, like the burning of his fathers.

17Ha ji ike bata Juda, buru ihe niile dị mma ha hụrụ nʼụlọeze, tinyere ụmụ nwoke ya niile na ndị nwunye ya niile. Ọ bụ naanị Ahazaya, nwa ya nwoke nke nta ka ha hapụrụ.

18Ọ bụ mgbe nke a gasịrị ka Onyenwe anyị mere ka ọrịa afọ nke a na-apụghị ịgwọta agwọta bịakwasị Jehoram.

19Mgbe afọ abụọ gasịrị, eriri afọ ya nupụtara nʼihi ọrịa ahụ. Ọ nwụkwara nʼoke ihe mgbu. Mgbe e liri ya, e meghị omenaala ịkwanye ọkụ olili dịka a na-eme nʼoge a na-eli ndị eze.

20Ọ gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze Jerusalem. Ọ chịrị afọ asatọ nwụọ. Ọnwụ ya abụghị ihe mwute nye onye ọbụla. E liri ya nʼobodo Devid ma ọ bụghị nʼime ili a na-eli ndị eze.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.