18Ọ bụ mgbe nke a gasịrị ka Onyenwe anyị mere ka ọrịa afọ nke a na-apụghị ịgwọta agwọta bịakwasị Jehoram.
19Mgbe afọ abụọ gasịrị, eriri afọ ya nupụtara nʼihi ọrịa ahụ. Ọ nwụkwara nʼoke ihe mgbu. Mgbe e liri ya, e meghị omenaala ịkwanye ọkụ olili dịka a na-eme nʼoge a na-eli ndị eze.
20Ọ gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze Jerusalem. Ọ chịrị afọ asatọ nwụọ. Ọnwụ ya abụghị ihe mwute nye onye ọbụla. E liri ya nʼobodo Devid ma ọ bụghị nʼime ili a na-eli ndị eze.