8Mgbe Jehu nọ na-emezu ihe e kpebiri nʼikpe banyere ezinaụlọ Ehab, o zutere ndị ozi Juda na ụmụ ndị ikom ụmụnne Ahazaya, ndị na-ejere Ahazaya ozi, gbuo ha niile.
9Ọ pụrụ ịchọ Ahazaya. Ndị ozi ya jidere ya ebe o zoro onwe ya na Sameria. Ha kpụtaara ya Jehu onye gburu ya. Ha liri ya, nʼihi na ha kwuru sị, “Nwa Jehoshafat ka ọ bụ, onye jiri obi ya niile gbasoo Onyenwe anyị.” Ya mere, o nwekwaghị onye dị ike nʼụlọ Ahazaya ijide alaeze ahụ.
10Mgbe Atalaya, nne Ahazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ gara nʼihu bido igbu ndị niile a mụrụ nʼụlọ eze, bụ ndị ezinaụlọ eze Juda.
11Ma Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, kuuru Joash nwa Ahazaya zopu ya site nʼetiti ụmụ eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina. Nʼihi na Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, bụ nwanne Ahazaya, ma bụrụkwa nwunye Jehoiada onye nchụaja, ya mere o jiri zonarị Atalaya nwantakịrị ahụ, ka ọ ghara igbu ya.
12Ya na ha nọgidere na nzuzo nʼime ụlọnsọ Chineke, afọ isii, oge ahụ niile Atalaya na-achị nʼala ahụ.