2 Ihe E Mere 22

Mgbe Jehu nọ na-emezu ihe e kpebiri nʼikpe banyere ezinaụlọ Ehab, o zutere ndị ozi Juda na ụmụ ndị ikom ụmụnne Ahazaya, ndị na-ejere Ahazaya ozi, gbuo ha niile.

2 Chronicles 22:8 (UKJV) And it came to pass, that, when Jehu was executing judgment upon the house of Ahab, and found the princes of Judah, and the sons of the brethren of Ahaziah, that ministered to Ahaziah, he slew them.

6ya mere, ọ lọghachitere na Jezril ka a gwọọ ya mmerụ ahụ ha merụrụ ya na Ramọt, nʼagha nke ya na Hazael eze Aram lụrụ. Mgbe ahụ, Ahazaya nwa Jehoram, eze Juda gara Jezril ileta Joram nwa Ehab, nʼihi na e merụrụ ya ahụ.

7Ọ bụ site na nleta Ahazaya gara leta Joram, ka Chineke si weta ọdịda Ahazaya. Mgbe Ahazaya bịarutere, ya na Joram pụrụ ịga zute Jehu nwa Nimshi, onye ahụ Onyenwe anyị tere mmanụ ka ọ laa ezinaụlọ Ehab nʼiyi.

8Mgbe Jehu nọ na-emezu ihe e kpebiri nʼikpe banyere ezinaụlọ Ehab, o zutere ndị ozi Juda na ụmụ ndị ikom ụmụnne Ahazaya, ndị na-ejere Ahazaya ozi, gbuo ha niile.

9Ọ pụrụ ịchọ Ahazaya. Ndị ozi ya jidere ya ebe o zoro onwe ya na Sameria. Ha kpụtaara ya Jehu onye gburu ya. Ha liri ya, nʼihi na ha kwuru sị, “Nwa Jehoshafat ka ọ bụ, onye jiri obi ya niile gbasoo Onyenwe anyị.” Ya mere, o nwekwaghị onye dị ike nʼụlọ Ahazaya ijide alaeze ahụ.

10Mgbe Atalaya, nne Ahazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ gara nʼihu bido igbu ndị niile a mụrụ nʼụlọ eze, bụ ndị ezinaụlọ eze Juda.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.