2 Ihe E Mere 23

Jehoiada mere ka ọgbụgba ndụ dị, na ya, na ndị mmadụ, na eze, ga-abụ ndị nke Onyenwe anyị.

2 Chronicles 23:16 (UKJV) And Jehoiada made a covenant between him, and between all the people, and between the king, that they should be the LORD's people.

14Jehoiada, bụ onye nchụaja zipụrụ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, bụ ndị na-elekọta usuu ndị agha, sị ha, “Sitenụ nʼetiti ahịrị ahụ kpụpụta ya nʼetiti ahịrị unu, onye ọbụla nke gbasoro ya, werenụ mma agha gbuo onye ahụ.” Nʼihi na onye nchụaja sịrị, “Ka egbula ya na ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.”

15Ya mere, ha jidere ya mgbe o rutere na mbata nke ọnụ ụzọ ịnyịnya nʼogige ụlọeze, ebe ahụ ka ha gburu ya.

16Jehoiada mere ka ọgbụgba ndụ dị, na ya, na ndị mmadụ, na eze, ga-abụ ndị nke Onyenwe anyị.

17Ndị niile ahụ gara nʼụlọ nchụaja Baal kwatuo ya. Ha tidasịrị ebe nchụaja na arụsị niile dị nʼebe ahụ, gbukwaa Matan onye nchụaja Baal nʼihu ebe ịchụ aja ahụ.

18Mgbe ahụ, Jehoiada nyefere nlekọta nke ụlọnsọ ukwuu Onyenwe anyị nʼaka ndị nchụaja bụ ndị Livayị, bụ ndị Devid nyere ọrụ ịchụ aja nsure ọkụ nke Onyenwe anyị nʼime ụlọnsọ, dịka e dere ya nʼiwu Mosis, nʼiji ọṅụ na ịbụ abụ dịka Devid nyere nʼiwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.