2 Ihe E Mere 23

Jehoiada, bụ onye nchụaja zipụrụ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, bụ ndị na-elekọta usuu ndị agha, sị ha, “Sitenụ nʼetiti ahịrị ahụ kpụpụta ya nʼetiti ahịrị unu, onye ọbụla nke gbasoro ya, werenụ mma agha gbuo onye ahụ.” Nʼihi na onye nchụaja sịrị, “Ka egbula ya na ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.”

2 Chronicles 23:14 (UKJV) Then Jehoiada the priest brought out the captains of hundreds that were set over the host, and said unto them, Have her out of the ranges: and whoso follows her, let him be slain with the sword. For the priest said, Slay her not in the house of the LORD.

12Mgbe Atalaya nụrụ mkpọtụ ndị mmadụ, ndị na-agba ọsọ na-eto eze, ọ gakwuru ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

13O lepụrụ anya, ma lee eze, ka o guzo nʼakụkụ ogidi ya dị na mbata. Ndịisi na ndị na-afụ opi nọ nʼakụkụ eze, ndị niile nke ala ahụ nọkwa na-aṅụrị ọṅụ na-afụ opi. Ndị ọbụ abụ jikwa iti egwu na-edu nʼabụ otuto. Mgbe ahụ, Atalaya dọwara uwe ya, sị, “Nke a bụ nnupu isi megide eze! Nke a bụ nnupu isi megide ọchịchị!”

14Jehoiada, bụ onye nchụaja zipụrụ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, bụ ndị na-elekọta usuu ndị agha, sị ha, “Sitenụ nʼetiti ahịrị ahụ kpụpụta ya nʼetiti ahịrị unu, onye ọbụla nke gbasoro ya, werenụ mma agha gbuo onye ahụ.” Nʼihi na onye nchụaja sịrị, “Ka egbula ya na ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.”

15Ya mere, ha jidere ya mgbe o rutere na mbata nke ọnụ ụzọ ịnyịnya nʼogige ụlọeze, ebe ahụ ka ha gburu ya.

16Jehoiada mere ka ọgbụgba ndụ dị, na ya, na ndị mmadụ, na eze, ga-abụ ndị nke Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.