2Ha pụrụ gaa akụkụ niile nke ala Juda kpọkọta ndị Livayị na ndịisi ezinaụlọ Izrel site nʼobodo niile. Mgbe ha bịarutere Jerusalem,
3ọgbakọ ahụ niile na eze gbara ndụ nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Mgbe ahụ, Jehoiada sịrị ha, “Nwa eze ga-achị dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa banyere agbụrụ Devid.
4Ugbu a, nke a bụ ihe unu ga-eme: Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ndị nchụaja na ndị Livayị, bụ ndị ga-abịa ọrụ nʼụbọchị izuike ga-abụ ndị ga-eche ọnụ ụzọ niile nche.
5Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ọzọ ga-anọ nʼụlọeze, ebe otu ụzọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ Ntọala. Ndị ọzọ niile ga-anọ gburugburu mpụta ụlọnsọ Onyenwe anyị.
6Ọ dịghị onye ọbụla ga-abata nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị karịa naanị ndị nchụaja na ndị Livayị ndị nọ ọrụ, ha ga-abata nʼihi ha bụ ndị edoro nsọ, ma ndị ọzọ niile ga-edebe iwu Onyenwe anyị, ghara ịbata.