2 Ihe E Mere 23

ọgbakọ ahụ niile na eze gbara ndụ nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Mgbe ahụ, Jehoiada sịrị ha, “Nwa eze ga-achị dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa banyere agbụrụ Devid.

2 Chronicles 23:3 (UKJV) And all the congregation made a covenant with the king in the house of God. And he said unto them, Behold, the king's son shall reign, as the LORD has said of the sons of David.

1Nʼafọ nke asaa, Jehoiada gosiri ịdị ike nke obi ya. Ya na ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha gbara ndụ. Ndị a bụ: Azaraya nwa Jeroham, Ishmel nwa Jehohanan, Azaraya nwa Obed, Maaseia nwa Adaya na Elishafat nwa Zikri.

2Ha pụrụ gaa akụkụ niile nke ala Juda kpọkọta ndị Livayị na ndịisi ezinaụlọ Izrel site nʼobodo niile. Mgbe ha bịarutere Jerusalem,

3ọgbakọ ahụ niile na eze gbara ndụ nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Mgbe ahụ, Jehoiada sịrị ha, “Nwa eze ga-achị dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa banyere agbụrụ Devid.

4Ugbu a, nke a bụ ihe unu ga-eme: Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ndị nchụaja na ndị Livayị, bụ ndị ga-abịa ọrụ nʼụbọchị izuike ga-abụ ndị ga-eche ọnụ ụzọ niile nche.

5Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ọzọ ga-anọ nʼụlọeze, ebe otu ụzọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ Ntọala. Ndị ọzọ niile ga-anọ gburugburu mpụta ụlọnsọ Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.