2 Ihe E Mere 23

Ndị Livayị ga-edo onwe ha gburugburu eze, onye ọbụla ga e jide ihe agha nʼaka ya. Onye ọbụla batara nʼime ụlọnsọ ahụ ka a ga-egbu. Nọrọnụ eze nso, ebe ọbụla ọ gara, mgbe ọ na-apụ nʼezi na mgbe ọ na-aba nʼime.”

2 Chronicles 23:7 (UKJV) And the Levites shall compass the king round about, every man with his weapons in his hand; and whosoever else comes into the house, he shall be put to death: but be all of you with the king when he comes in, and when he goes out.

5Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ọzọ ga-anọ nʼụlọeze, ebe otu ụzọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ Ntọala. Ndị ọzọ niile ga-anọ gburugburu mpụta ụlọnsọ Onyenwe anyị.

6Ọ dịghị onye ọbụla ga-abata nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị karịa naanị ndị nchụaja na ndị Livayị ndị nọ ọrụ, ha ga-abata nʼihi ha bụ ndị edoro nsọ, ma ndị ọzọ niile ga-edebe iwu Onyenwe anyị, ghara ịbata.

7Ndị Livayị ga-edo onwe ha gburugburu eze, onye ọbụla ga e jide ihe agha nʼaka ya. Onye ọbụla batara nʼime ụlọnsọ ahụ ka a ga-egbu. Nọrọnụ eze nso, ebe ọbụla ọ gara, mgbe ọ na-apụ nʼezi na mgbe ọ na-aba nʼime.”

8Ndị Livayị na ndị ikom Juda niile mere dịka Jehoiada, onye nchụaja nyere nʼiwu. Onye ọbụla kpọọrọ ndị ikom ya, ma ndị na-abata ịrụ ọrụ nʼụbọchị izuike ma ndị na-emechi ọrụ. Nʼihi na Jehoiada onye nchụaja ezipụghị otu ọbụla nʼime ndị ọrụ ahụ niile.

9O nyere ndị ọchịagha ahụ na-elekọta narị ndị agha, ùbe na ọta ukwu na ọta nta niile, ndị bụrịị nke eze Devid, bụ ndị dị nʼụlọnsọ Chineke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.