6O ji narị talenti ọlaọcha gota narị puku ndị agha site nʼala Izrel.
7Ma otu onye nke Chineke bịakwutere ya, sị ya; “Eze, ka ndị agha a si Izrel ghara isonyere gị, nʼihi na Onyenwe anyị anọnyereghị ndị Izrel, ọ nọnyereghị onye ọbụla sitere nʼIfrem.
8A sịkwarị na i jiri obi dimkpa ga agha a, Chineke ga-eme ka ndị iro gị merie gị, nʼihi na Chineke bụ onye nwere ike inyere mmadụ aka maọbụ ime ka ọ sụọ ngọngọ.”
9Amazaya sịrị onye nke Chineke ahụ, “Gịnị kwanụ ka anyị ga-eme banyere narị ego talenti m kwụrụ maka ndị agha Izrel?” Onye nke Chineke ahụ zara, “Onyenwe anyị pụrụ inye gị karịa nke ahụ.”
10Amazaya zighachiri ndị agha Izrel ahụ azụ ka ha laa, bụ ndị a si nʼIfrem bịakwute ya. Ha were iwe nke ukwuu megide Juda, jirikwa oke iwe laghachi nʼụlọ ha.