1Hezekaya gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ị bụ eze. Ọ chịrị iri afọ abụọ na itoolu na Jerusalem. Aha nne ya bụ Abija, ada Zekaraya.
2O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka nna nna ya Devid mere.
3Nʼọnwa mbụ nke afọ ahụ e mere ya eze ka o meghere ụlọnsọ Onyenwe anyị, mezie ime ya.
4Ọ kpọrọ ndị Livayị, na ndị nchụaja niile oku nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ukwu Chineke,