2 Ihe E Mere 29

Ọ kpọrọ ndị Livayị, na ndị nchụaja niile oku nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ukwu Chineke,

2 Chronicles 29:4 (UKJV) And he brought in the priests and the Levites, and gathered them together into the east street,

2O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka nna nna ya Devid mere.

3Nʼọnwa mbụ nke afọ ahụ e mere ya eze ka o meghere ụlọnsọ Onyenwe anyị, mezie ime ya.

4Ọ kpọrọ ndị Livayị, na ndị nchụaja niile oku nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ukwu Chineke,

5gwa ha okwu sị ha, “Geenụ m ntị unu ndị Livayị, doonụ onwe unu nsọ, dokwaanụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị Chineke nna nna unu nsọ. Wezuganụ ihe arụ niile dị nʼebe nsọ nke ụlọnsọ ahụ.

6Nʼihi na nna anyị ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi; ha mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, hapụ ya. Ha wepụrụ ihu ha site nʼebe obibi Onyenwe anyị, gbakụtakwa ya azụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.