2 Ihe E Mere 29

O mere ka ụfọdụ ndị Livayị nọdụ nʼụlọnsọ ahụ, dịka ndị na-abụ abụ. O nyere ha ogene, na une, na ụbọ akwara. O mere nke a nʼusoro dịka Devid na Gad, bụ ọhụ ụzọ eze, na Netan, bụ onye amụma, nke a bụ dịka Onyenwe anyị nyererịị nʼiwu site nʼaka ndị amụma ya.

2 Chronicles 29:25 (UKJV) And he set the Levites in the house of the LORD with cymbals, with psalteries, and with harps, according to the commandment of David, and of Gad the king's seer, and Nathan the prophet: for so was the commandment of the LORD by his prophets.

23Ha wetara mkpi ndị ahụ eji achụ aja mmehie nʼihu eze na ọgbakọ ahụ, ha bikwasịkwara ha aka nʼelu.

24Ndị nchụaja gburu mkpi ndị ahụ, chee ọbara ha nʼelu ebe nchụaja maka ikpuchi mmehie ndị Izrel niile. Nʼihi na eze nyere iwu ka a chụọ aja nsure ọkụ na aja mmehie nʼihi ndị Izrel niile.

25O mere ka ụfọdụ ndị Livayị nọdụ nʼụlọnsọ ahụ, dịka ndị na-abụ abụ. O nyere ha ogene, na une, na ụbọ akwara. O mere nke a nʼusoro dịka Devid na Gad, bụ ọhụ ụzọ eze, na Netan, bụ onye amụma, nke a bụ dịka Onyenwe anyị nyererịị nʼiwu site nʼaka ndị amụma ya.

26Ya mere, ndị Livayị ji ihe egwu Devid ndị ahụ niile guzoro na njikere, ma ndị nchụaja jikwa opi ha nke ha na-afụ.

27Hezekaya nyere iwu ka a chụọ aja nsure ọkụ ahụ nʼelu ebe ịchụ aja. Mgbe a malitere isure aja ahụ ọkụ, a malitekwara ịbụ abụ nye Onyenwe anyị, na ịfụ opi na iti ihe egwu niile nke Devid, eze Izrel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.