25O mere ka ụfọdụ ndị Livayị nọdụ nʼụlọnsọ ahụ, dịka ndị na-abụ abụ. O nyere ha ogene, na une, na ụbọ akwara. O mere nke a nʼusoro dịka Devid na Gad, bụ ọhụ ụzọ eze, na Netan, bụ onye amụma, nke a bụ dịka Onyenwe anyị nyererịị nʼiwu site nʼaka ndị amụma ya.
26Ya mere, ndị Livayị ji ihe egwu Devid ndị ahụ niile guzoro na njikere, ma ndị nchụaja jikwa opi ha nke ha na-afụ.
27Hezekaya nyere iwu ka a chụọ aja nsure ọkụ ahụ nʼelu ebe ịchụ aja. Mgbe a malitere isure aja ahụ ọkụ, a malitekwara ịbụ abụ nye Onyenwe anyị, na ịfụ opi na iti ihe egwu niile nke Devid, eze Izrel.
28Nʼoge mmemme ọchụchụ aja ahụ, mmadụ niile kpọrọ isiala nye Chineke, mgbe ndị abụ na-abụ abụ, ndị opi na-afụkwa opi ha. Ihe niile a nọ na-eme tutu ruo mgbe a chụsịrị aja niile ahụ.
29Mgbe ha chụchara aja ndị ahụ, eze na ndị niile nọ nʼebe ahụ gburu ikpere nʼala, kpọkwaa isiala.